Izrel akpọlitela ndịagha 60,000 ọhụrụ dịka ha na-akwado ịwakpo ma were ọnọdụ na Gaza niile

Izrel akpọlitela ndịagha 60,000 ọhụrụ dịka ha na-akwado ịwakpo ma were ọnọdụ na Gaza niile


Mele Kyari kwuru n’oge gara aga na aka ya adịghị na nrụrụaka ọbụla oge ọ nọ n’ọkwa dịka onyeisi ụlọọrụ NNPCL.

Ebe foto si, Getty Images/EFCC/X

Ụlọikpe
ukwu etiti dị n’Abuja enyela iwu ka a machie akara ọbaego anọ Mele Kyari nwere
n’ụlọakụ Jaiz Bank maka ebubo nrụrụaka na mpụ dị iche iche.

Ọkaikpe
Emeka Nwite nyere iwu n’ụbọchị Tuzde 19 Ọgọst dịka ọkaiwu ụlọọrụ Economic and
Financial Crimes Commission (EFCC) BỤ Ogechi Ujam degara akwụkwọ ma rịọ ụlọikpe
ahụ ka ọ machie akara ọbaego ndị ahụ ruo oge ụlọọrụ EFCC mechara nnyocha ha.

Ọkaikpe
Nwite kwuru na o nyere iwu ahụ maka na o kwenyere na akwụkwọ arịrịọ ahụ EFCC wetara
nakwa ihe akaebe ya na ya so bụ nke tozuru etozu.

Ọkaikpe
Nwite yigharịrị ikpe ahụ n’ụbọchị Tuzde 23 Septemba, 2025 bụ ụbọchị ụlọikpe
ga-anụ nchọpụta nnyocha EFCC mere.

Cheta na n’ụbọchị
Mọnde 11 Ọgọst, 2025, ụlọọrụ EFCC gbara akwụkwọ ma kwuo na aka Mele Kyari dị n’akara
ọbaego ndị ahụ ha chọpụtara na ego dị n’ime ha bụ nke e nwetara site na nrụrụaka
na mpụ.

EFCC gwara ụlọikpe
ka ha nye iwu maka mmachi akara ọbaego 0017922724 – Mele Kyari, akara ọbaego 0018575055
– Guwori Community Development Foundation na akara ọbaego 0018575141 – Guwori
Community Development Foundation (Flood Relief). Akara ọbaego ndị a niile dị n’ụlọakụ
Jaiz Bank.

EFCC kwuru na nnyocha mbụ ha mere chọpụtara na ego ruru narị
nde naịra isii (600m) dị n’ọbaego ndị ahụ bụ nke e nwetara site na nrụrụaka
nakwa ihe ndị ọzọ megidere iwu.

EFCC kọwara na ha chọpụtara na Mele Kyari ji akara ọbaego ndị
ahụ anara ego si n’ụlọọrụ NNPCL nakwa ọtụtụ ụlọorụ mmanụ agbidi ndị ọzọ.

N’aka nke ọzọ, Mele Kyari kwuru n’oge gara aga na aka ya adịghị
na nrụrụaka ọbụla oge ọ nọ n’ọkwa dịka onyeisi ụlọọrụ NNPCL.

Ọ gọnarịrị na ụlọọrụ EFCC nwuchiri ya maka nrụrụaka ijeri dọla
abụọ na ụma atọ ($2.6billion) e wepụtara maka ịrụzi ụlọọrụ mmanụ agbidi Naịjirịa.

N’out ozi o wepụtara n’akara X ya n’ọnwa Mee, Mele Kyari
gbara afọ 60 kọwara ebubo ndị ahụ dịka aka ọrụ ndị na-agba ya mgba okpuru chọrọ
imetọ aha ya. O kwuru na ya kwụrụ chịm ịzara ọnụ ya n’ebubo ndị ahụ.



Source link

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *